
Amàm onye m bu
Amàm ihe m pụrụ ime
Ikuku si mu na ngụgụ bá na oja
Ndi muo agba kuno
ogene bia kwu zie
Madu na muo eju ebenile.
ejighị inwe ego wèrè màrà m
mana m pụta na ọgbọ
Mmemme acha kee
Ifu m n'uzor
i'kele m ofụma
maka na eso m
na ihe Igbo ji dị ebube.
